Ndị Filipai 3

Ka anyị jidesienụ aka ike naanị nʼihe ahụ anyị nweterela.

Philippians 3:16 (UKJV) Nevertheless, whereto we have already attained, let us walk by the same rule, let us mind the same thing.

14Ana m agbasi ọsọ ike iji gbaruo nʼisi, maka irite ihe ahụ a na-agbata nʼọsọ, bụ ọkpụkpọ ịbanye na ndụ eluigwe ahụ nke Chineke kpọrọ m site na Jisọs Kraịst.

15Ka anyị niile, bụ ndị tozuru oke nʼime mmụọ nwee uche dị otu a. Ọ bụrụkwa na ụfọdụ nʼime unu nwere uche ọzọ dị iche, Chineke ga-ekpughere unu nke a.

16Ka anyị jidesienụ aka ike naanị nʼihe ahụ anyị nweterela.

17Ụmụnna m, na-agbasonu ụdị ndụ m na-ebi, chọpụtakwanụ ndị ọzọ na-adị ndụ dị ka anyị si adị, mee ha ihe ilere anya unu.

18Nʼihi na agwala m unu nke a ọtụtụ mgbe, na-achọkwa ịgwa unu ya ọzọ ugbu a. Lee, anya mmiri dị m nʼanya ugbu a m na-ekwu ya sị na e nwere ọtụtụ ndị na-ebi ndụ ha dị ka ha bụ ndị iro obe Kraịst nʼezie.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.