1Na nchịkọta okwu ndị a niile, ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị. Ike adịghị agwụ m ịgwa unu ihe ndị a. Ọ bakwaara unu uru ịnụ ụdị okwu a mgbe niile.
2Kpachapụrụnụ onwe unu anya nʼebe ndị mmadụ ọjọọ ahụ yiri nkịta nọ. Ndị ahụ na-eyiwasị ahụ ha.
3Nʼihi na ọ bụ anyị bụ ndị ezi obibi ugwu ahụ, ọ bụghị ha, nʼihi na anyị bụ ndị na-efe Chineke site na Mmụọ ya. Anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime Kraịst Jisọs. Anyị adịghị atụkwasị obi nʼihe e mere nʼanụ ahụ.
4Mụ onwe m nwere ike nwee ntụkwasị obi nʼihe ndị a. Nʼihi na e nwee onye chere na ọ pụrụ ịtụkwasị obi ya nʼanụ ahụ, mụ onwe m nwere ụdị ntụkwasị obi ahụ karịa onye ahụ: