2Kpachapụrụnụ onwe unu anya nʼebe ndị mmadụ ọjọọ ahụ yiri nkịta nọ. Ndị ahụ na-eyiwasị ahụ ha.
3Nʼihi na ọ bụ anyị bụ ndị ezi obibi ugwu ahụ, ọ bụghị ha, nʼihi na anyị bụ ndị na-efe Chineke site na Mmụọ ya. Anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime Kraịst Jisọs. Anyị adịghị atụkwasị obi nʼihe e mere nʼanụ ahụ.
4Mụ onwe m nwere ike nwee ntụkwasị obi nʼihe ndị a. Nʼihi na e nwee onye chere na ọ pụrụ ịtụkwasị obi ya nʼanụ ahụ, mụ onwe m nwere ụdị ntụkwasị obi ahụ karịa onye ahụ:
5e biri m ugwu nʼabalị nke asatọ site na mgbe a mụrụ m, abụ m onye Izrel, sitere nʼagbụrụ Benjamin; abụ m onye Hibru a mụrụ nʼetiti ndị Hibru; dị ka o si metụta iwu abụ m onye Farisii;
6igosi ịnụ ọkụ nʼobi m, akpagburu m chọọchị, nʼụzọ ezi omume nʼokpuru iwu, abụ m onye zuruoke.