9Na-emenụ ihe ọbụla unu si nʼaka m mụta, maọbụ ihe unu nụrụ, ma ọ bụkwanụ ihe unu hụrụ m ka m na-eme. Chineke onye na-enye udo ga-anọnyekwara unu.
10Ana m aṅụrị ọṅụ dị ukwuu nʼime Onyenwe anyị nʼihi na unu mechara malite iche echiche ọzọ banyere m. Unu bu m nʼobi nʼeziokwu ma unu enwetaghị ohere izipụta ya.
11Ọ bụghị na m nọ nʼọnọdụ oke mkpa na ụkọ. Nʼihi na amụtala m otu m ga-esi jiri ọṅụ nọrọ nʼọnọdụ ọbụla.
12Amụtala m otu m ga-esi nọrọ mgbe ihe siri ike na mgbe ihe bara ụba. Amụtakwala m otu m ga-esi nwee afọ ojuju nʼọnọdụ ọbụla, maọbụ mgbe m na-anọ agụụ, maọbụ mgbe m rijuru afọ, maọbụ mgbe m nwere ihe dị ukwuu maọbụ nʼoge ụkọ.
13Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.