Ndị Filipai 4

Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.

Philippians 4:13 (UKJV) I can do all things through Christ which strengthens me.

11Ọ bụghị na m nọ nʼọnọdụ oke mkpa na ụkọ. Nʼihi na amụtala m otu m ga-esi jiri ọṅụ nọrọ nʼọnọdụ ọbụla.

12Amụtala m otu m ga-esi nọrọ mgbe ihe siri ike na mgbe ihe bara ụba. Amụtakwala m otu m ga-esi nwee afọ ojuju nʼọnọdụ ọbụla, maọbụ mgbe m na-anọ agụụ, maọbụ mgbe m rijuru afọ, maọbụ mgbe m nwere ihe dị ukwuu maọbụ nʼoge ụkọ.

13Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.

14Ma unu mere nnọọ nke ọma inyere m aka nʼọnọdụ nsogbu nke m nọ nʼime ya.

15Unu onwe unu ndị Filipai maara na mbido nke oziọma a, mgbe m hapụrụ Masidonia, na o nweghị nzukọ ọzọ nyere m aka nʼinye maọbụ ịnabata onyinye, ma e wezuga unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.