Ndị Filipai 4

Arịrịọ m na-arịọ Yodia na Sintiki bụ, ha biko, nwe otu uche nʼime Onyenwe anyị.

Philippians 4:2 (UKJV) I plead to Euodias, and plead to Syntyche, that they be of the same mind in the Lord.

1Ya mere, ụmụnna m, ndị m hụrụ nʼanya, na ndị ihe ha na-agụsị m agụụ ike, unu ndị na-enye m ọṅụ, na ndị bụ okpueze m nʼihi ọrụ m na-arụ, bikonu, guzosienụ ike nʼime Onyenwe anyị.

2Arịrịọ m na-arịọ Yodia na Sintiki bụ, ha biko, nwe otu uche nʼime Onyenwe anyị.

3E, ana m arịọkwa gị, ezi onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, biko, nyere ụmụ nwanyị ndị a aka nʼihi na ha abụọ bụ ndị so m rụọ ọrụ ikwusa oziọma nye ndị ọzọ. Ha sokwa Klement rụọkwa ọrụ, bụ ndị ahụ e dere aha ha nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ.

4Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile nʼime Onyenwe anyị. Ka m kwuokwa ya ọzọ, ṅụrịanụ ọṅụ!

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.