3E, ana m arịọkwa gị, ezi onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, biko, nyere ụmụ nwanyị ndị a aka nʼihi na ha abụọ bụ ndị so m rụọ ọrụ ikwusa oziọma nye ndị ọzọ. Ha sokwa Klement rụọkwa ọrụ, bụ ndị ahụ e dere aha ha nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ.
4Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile nʼime Onyenwe anyị. Ka m kwuokwa ya ọzọ, ṅụrịanụ ọṅụ!
5Meenụ ka mmadụ niile jiri anya ha hụ na unu bụ ndị obiọma nʼihe niile unu na-eme. Chetanụ na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso.
6Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke.
7Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọbụla mmadụ nwere ike ịghọta, ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nʼime Kraịst Jisọs.