Ilu 1

ebe ọ bụ na unu akpọla ndụmọdụ m asị, jụkwa ịnabata ịba mba m nye unu,

Proverbs 1:25 (UKJV) But all of you have set at nothing all my counsel, and refused my reproof:

23Ọ bụrụ na unu gere ntị na mba m na-abara unu, aga m awụpụ echiche niile nke obi m nye unu, aga m emekwa ka unu mara okwu m.

24Ma ebe ọ bụ na unu egeghị ntị mgbe m kpọrọ oku, setịpụkwa aka m nye unu ma ọ dịghị onye ṅara ntị,

25ebe ọ bụ na unu akpọla ndụmọdụ m asị, jụkwa ịnabata ịba mba m nye unu,

26ụbọchị unu ga-adaba na mmekpa ahụ, aga m achị ọchị. Mgbe ihe egwu bịakwasịrị unu, aga m akwa unu emo.

27Mgbe oke ihe egwu ga-abịakwasị unu dịka ikuku dị ike, mgbe nhụju anya ga-erubiga nʼelu unu dịka oke ifufe, mgbe ịta ahụhụ na nsogbu ga-agbagwoju unu anya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.