25ebe ọ bụ na unu akpọla ndụmọdụ m asị, jụkwa ịnabata ịba mba m nye unu,
26ụbọchị unu ga-adaba na mmekpa ahụ, aga m achị ọchị. Mgbe ihe egwu bịakwasịrị unu, aga m akwa unu emo.
27Mgbe oke ihe egwu ga-abịakwasị unu dịka ikuku dị ike, mgbe nhụju anya ga-erubiga nʼelu unu dịka oke ifufe, mgbe ịta ahụhụ na nsogbu ga-agbagwoju unu anya.
28“Agaghị m ege ntị nʼakwa unu, ọ bụ ezie na unu ga na-akpọ m. Unu ga-achọkwa m ma unu agaghị achọta m.
29Nʼihi na unu mechiri anya unu nʼebe ihe ọmụma dị, unu atụghị egwu Onyenwe anyị.