27Mgbe oke ihe egwu ga-abịakwasị unu dịka ikuku dị ike, mgbe nhụju anya ga-erubiga nʼelu unu dịka oke ifufe, mgbe ịta ahụhụ na nsogbu ga-agbagwoju unu anya.
28“Agaghị m ege ntị nʼakwa unu, ọ bụ ezie na unu ga na-akpọ m. Unu ga-achọkwa m ma unu agaghị achọta m.
29Nʼihi na unu mechiri anya unu nʼebe ihe ọmụma dị, unu atụghị egwu Onyenwe anyị.
30Unu aṅaghị ntị na ndụmọdụ m. Unu lelịrị ịba mba m anya.
31Ihe niile unu kụrụ ka unu ga-aghọta. Ọ bụkwa ụzọ unu na ndụmọdụ unu ga-eju unu afọ.