5Ka onye maara ihe gee ntị, tụkwasịkwa ihe nʼihe ọ maara, ka ndị nwere nghọta nwetakwa ezi ndụmọdụ.
6Ka ha ghọta ilu niile na okwu niile na-esi nʼọnụ ndị maara ihe.
7Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite ihe ọmụma. Ọ bụkwa naanị ndị nzuzu bụ ndị na-adịghị anabata amamihe na ịdọ aka na ntị.
8Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị ahapụkwala ndụmọdụ nne gị.
9Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị, bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị.