3nʼihi inweta ntụziaka nʼinwe uche, ime ezi omume na ikpe ziri ezi nke aghụghọ na-adịghị.
4Nʼihi ime ka ndị na-enweghị uche nwee ezi uche, ka ndị na-eto eto nweta ihe ọmụma na izuzu ọma.
5Ka onye maara ihe gee ntị, tụkwasịkwa ihe nʼihe ọ maara, ka ndị nwere nghọta nwetakwa ezi ndụmọdụ.
6Ka ha ghọta ilu niile na okwu niile na-esi nʼọnụ ndị maara ihe.
7Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite ihe ọmụma. Ọ bụkwa naanị ndị nzuzu bụ ndị na-adịghị anabata amamihe na ịdọ aka na ntị.