7Ọ dị mmadụ na-eme ka ọ bụ ọgaranya maọbụ onye ụkpa. Ma ọ dịkwa mmadụ na-eme ka ọ bụ onye ụkpa maọbụ ọgaranya.
8Ọgaranya nwere ike jiri ego ya gbapụta onwe ya, ma ogbenye adịghị azaghachi mba banyere imerụ ya ahụ.
9Ìhè onye ezi omume na-enwupụ enwupụ, ma oriọna onye mmebi iwu ga-anyụ.
10Nganga na-eweta esemokwu, ma a na-ahụ amamihe nʼime ndụ ndị na-anata ndụmọdụ.
11Akụ a kpatara ngwangwa na-emebikwa ngwangwa; ma akụ sitere nʼịrụsị ọrụ ike na-eto eto.