10Egbugbere ọnụ eze na-ekwu okwu sitere na-ezi nghọta, ọnụ ya adịghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.
11Ihe ọtụtụ ziri ezi na ihe niile ha nʼotu dịrị Onyenwe anyị, ihe niile e ji atụ ihe dị nʼime akpa bụ ya mere ha.
12Ndị eze kpọrọ ime ihe na-adịghị mma asị, nʼihi na site nʼezi omume ka ocheeze ji eguzosi ike.
13Ndị eze na-enwe mmasị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu eziokwu, ha na-agụ onye na-ekwu eziokwu dị ka ezi mmadụ.
14Iwe eze bụ onyeozi nke ọnwụ. Onye maara ihe ga-eme ka ọ dajụọ.