19Ọ ka mma ịbụ onye ogbenye nwere obi umeala karịa ịbụ onye nganga, na onye so ndị nganga keta oke nʼihe ha kwatara nʼagha.
20Onye ọbụla na-aṅa ntị na ndụmọdụ ka ihe na-agara nke ọma, onye a gọziri agọzi bụ onye ahụ nke na-atụkwasị Onyenwe anyị obi.
21A na-amata onye nwere uche site nʼụdị nghọta o nwere. Okwu dị ụtọ na-eme ka mmadụ mụta ihe nke ọma.
22Inwe uche bụ isi iyi ndụ nye ndị niile nwere ya, ma enweghị uche na-ewetara ndị nzuzu ntaramahụhụ.
23Obi onye maara ihe na-eme ka e tinye uche nʼokwu ọnụ ya, egbugbere ọnụ ha na-emekwa ka mmụta gaa nʼihu.