9Onye ọbụla na-akwado ịhụnanya na-ekpuchi njehie, ma onye na-ekwu ihe mere mgbe na mgbe na-ekewa ezi enyi.
10Ịba mba ntakịrị a baara onye nwere nghọta bara uru karịa narị ụtarị nke a pịara onye nzuzu.
11Onye ọjọọ na-ebi naanị ndụ nnupu isi megide Chineke. Ọ bụkwa onyeozi nke ọnwụ ka a ga-eziga imegide ya.
12Ọ ka mma izute nne Bịa a napụrụ ụmụ ya karịa izute onye nzuzu uche ya gbagọrọ agbagọ.
13Ọ bụrụ na i jiri ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọma, ọbụbụ ọnụ dịrị ezinaụlọ gị.