21Ọ bụ naanị iru ụjụ na obi ọjọọ dịịrị nna nke nwa ya na-eme ihe nzuzu.
22Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ sie ike, ma mmụọ na-eru ụjụ oge niile na-akpata ọrịa.
23Onye ajọ omume na-anara ihe ngarị na nzuzo ka ọ sụgharịa ikpe ziri ezi isi.
24Onye nwere nghọta na-eche uche amamihe nʼihe ọ na-eme, ma anya onye nzuzu na-elegharị ruo na nsọtụ nke ụwa.
25Nwa dị nzuzu na-ewetara nna ya mwute, bụrụkwa nne mụrụ ya ihe ilu.