25Nwa dị nzuzu na-ewetara nna ya mwute, bụrụkwa nne mụrụ ya ihe ilu.
26Ọ bụrụ na ịra onye ezi omume nra adịghị mma, nʼezie, ịpịa ndị ọrụ ihe nʼihi ezi ọrụ ha ezighị ezi.
27Nwoke ahụ na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu bụ onye maara ihe, onye mmụọ ya dịkwa jụụ bụ onye nwere nghọta.
28A ga-agụ onye nzuzu nʼonye maara ihe ma ọ bụrụ na ha gba nkịtị, gụọkwa ha na ndị nwere nghọta ma ọ bụrụ na ha e jide ire ha.