22Obi ebere mmadụ na-eme ka a na-achọsi ya ike. Ọ ka mma ịbụ ogbenye karịa ịbụ mmadụ nke eziokwu ọbụla na-adịghị nʼọnụ ya.
23Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-eweta ndụ na ọṅụ, na nchebe site nʼihe mmerụ ahụ.
24Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri, ọ gaghị eweghachi ya ọ bụladị tinye nʼọnụ ya.
25Tie onye na-akwa emo ihe, onye na-enweghị uche ga-aghọ onye nwere ezi uche, baara onye nwere nghọta mba, ha ga-enweta ihe ọmụma.
26Ọ bụ nwa ahụ na-eweta ihere ga-ezu nne na nna ya ohi, maọbụ chụpụ ha site nʼụlọ ya.