18Ụlọ nwanyị dị otu a dị nʼokporoụzọ nke na-eduba nʼọnwụ na nʼọkụ ala mmụọ.
19Ndị ikom niile banyere nʼụlọ ha na-ala nʼiyi. Ha adịghị alọtakwa nʼokporoụzọ nke na-eduba na ndụ.
20Nʼihi nke a, ị ga-aga ije nʼụzọ ndị ezi omume, debekwa ụkwụ gị nʼokporoụzọ niile nke ndị ezi omume,
21nʼihi na ọ bụ naanị ndị ziri ezi ga-ebi nʼala ahụ, ndị na-enweghị ịta ụta ga-afọdụkwa nʼime ya.
22Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ site nʼala ahụ, ọ bụkwa ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi ka a ga-ewezuga na ya.