2tọọ ntị gị nʼala nye amamihe, wepụta obi gị inwe nghọta.
3E, ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọmụma ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị,
4ọ bụrụ na ị na-achọ ya dịka i si achọ ọlaọcha maọbụ akụ nke zoro ezo,
5mgbe ahụ, ị ga-aghọtakwa ihe bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị chọtakwa ihe ọmụma nke Chineke.
6Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-enye amamihe; nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa.