10Chụpụ onye na-akwa emo, ise okwu ga-akwụsị, e, ịlụ ọgụ na nlelị ga-akwụsịkwa.
11Onye na-ahụ ịdị ọcha nke obi nʼanya, onye okwu ya jupụtara nʼamara ga-abụ enyi eze.
12Anya Onyenwe anyị na-echebe ihe ọmụma, ma ọ na-emebi atụmatụ niile nke ndị aghụghọ.
13Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼezi! A ga-egbu m nʼama ọha mmadụ!”
14Ọnụ nwanyị na-akwa iko bụ oke olulu, nwoke nọ nʼokpuru oke iwe Onyenwe anyị na-adaba nʼime ya.