12Anya Onyenwe anyị na-echebe ihe ọmụma, ma ọ na-emebi atụmatụ niile nke ndị aghụghọ.
13Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼezi! A ga-egbu m nʼama ọha mmadụ!”
14Ọnụ nwanyị na-akwa iko bụ oke olulu, nwoke nọ nʼokpuru oke iwe Onyenwe anyị na-adaba nʼime ya.
15Obi ụmụntakịrị jupụtara nʼenweghị uche, ma apịpịa ịdọ aka na ntị ga-achụpụ ya nʼebe dị anya.
16Onye na-achọ uru site nʼimegbu onye na-enweghị ike, maọbụ onye na-enye ọgaranya onyinye ga-ebi nʼoke ụkọ.