Ilu 22

Ma ogbenye ma ọgaranya bụ otu nʼihu Onyenwe anyị onye kere ha niile.

Proverbs 22:2 (UKJV) The rich and poor meet together: the LORD is the maker of them all.

1Ihe nhọrọ dị ezi mma ka aha ọma bụ karịa ọtụtụ akụ, ịnata amara ihuọma ka mma karịa ọlaọcha na ọlaedo.

2Ma ogbenye ma ọgaranya bụ otu nʼihu Onyenwe anyị onye kere ha niile.

3Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya, ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya.

4Obi umeala bụ egwu Onyenwe anyị, ụgwọ ọ na-akwụ bụ akụnụba, na nsọpụrụ na ndụ ogologo.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.