18Ọ dị ụtọ ma idebe ha nʼobi gị, ma ha dịkwa nʼegbugbere ọnụ gị mgbe niile.
19Ọ bụ ka ntụkwasị obi gị dị nʼime Onyenwe anyị, ya ka m na-akụziri gị taa, ọbụladị gị onwe gị.
20Ọ bụ na m edepụtabereghị gị iri ndụmọdụ atọ ndị a, bụ okwu ndụmọdụ na ihe ọmụma?
21Ha na-ezi gị ihe bụ ikwesi ntụkwasị obi na ikwu eziokwu. Mgbe ahụ ọ bụrụ na-ezie gị sị gị gaa chọta eziokwu ị ga-eji ezi ọsịsa lọghachi.
22Emegbula ogbenye nʼihi na ọ bụ ogbenye. Emegidekwala ya nʼụzọ ikpe.