16Onye na-achọ uru site nʼimegbu onye na-enweghị ike, maọbụ onye na-enye ọgaranya onyinye ga-ebi nʼoke ụkọ.
17Lezie anya gee ntị nʼokwu niile nke ndị maara ihe, tinye uche gị nʼihe m na-akụzi.
18Ọ dị ụtọ ma idebe ha nʼobi gị, ma ha dịkwa nʼegbugbere ọnụ gị mgbe niile.
19Ọ bụ ka ntụkwasị obi gị dị nʼime Onyenwe anyị, ya ka m na-akụziri gị taa, ọbụladị gị onwe gị.
20Ọ bụ na m edepụtabereghị gị iri ndụmọdụ atọ ndị a, bụ okwu ndụmọdụ na ihe ọmụma?