22Emegbula ogbenye nʼihi na ọ bụ ogbenye. Emegidekwala ya nʼụzọ ikpe.
23Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ekwuchitere ha ọnụ ha ma bibiekwa ndị na-emegide ha.
24Gị na onye na-ewe oke iwe abụla enyi, gị na onye na-ewe iwe ọsịịsọ emekọkwala ihe,
25ma ọ bụghị ya, i nwere ike ịmụta ndụ ha, si otu a tinye ndụ gị na nsogbu.
26Abụla onye otu nʼime ndị na-anara ndị mmadụ akaebe maọbụ kwee nkwa ikwu ụgwọ onye ọzọ ji.