3Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya, ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya.
4Obi umeala bụ egwu Onyenwe anyị, ụgwọ ọ na-akwụ bụ akụnụba, na nsọpụrụ na ndụ ogologo.
5Ogwu na igbudu dị nʼụzọ onye na-emebi iwu; ma onye kpọrọ ndụ ya ihe na-asọ ya asọ.
6Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi, mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya.
7Dịka ọgaranya si achị ogbenye, otu a kwa ka onye na-ebi ego si bụrụ ohu onye na-ebinye ya ego.