7Dịka ọgaranya si achị ogbenye, otu a kwa ka onye na-ebi ego si bụrụ ohu onye na-ebinye ya ego.
8Onye na-agha ikpe na-ezighị ezi dịka mkpụrụ, ga-ewe ajọ ihe dịka ihe ubi, mkpanaka nke ikike iwe ha ga-agbajikwa.
9Onye na-agbasapụ aka enye onyinye ga-abụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na ha na ekenyetụ ndị ogbenye nri.
10Chụpụ onye na-akwa emo, ise okwu ga-akwụsị, e, ịlụ ọgụ na nlelị ga-akwụsịkwa.
11Onye na-ahụ ịdị ọcha nke obi nʼanya, onye okwu ya jupụtara nʼamara ga-abụ enyi eze.