33Anya gị abụọ ga-ahụ ihe ị na-amaghị isi ya na ọdụ ya, obi gị ga-atụlekwa ihe ndị na-agbagwoju anya.
34Ị ga-adị ka onye na-edina nʼetiti oke osimiri, nke na-edinakwa nʼelu ụdọ nʼejide ụgbọ.
35Ị ga-asị, “Ha tiri m ihe, ma emerụghị m ahụ. Ha pịara m ihe, ma amaghị m. Olee mgbe m ga-eteta, ka m pụọ ga chọọ mmanya ọzọ?”