2Nʼihi na-atụmatụ obi ha niile bụ otu ha ga-esi mee ihe ike, egbugbere ọnụ ha na-ekwu naanị maka ọgbaaghara.
3Ọ bụ amamihe ka e ji ewu ụlọ, ọ bụkwa nghọta ka e ji eme ka o guzosie ike.
4Sitekwa nʼihe ọmụma ka akụ niile ji ejupụta nʼime ya, bụ akụ ndị pụrụ iche ma dịkwa oke ọnụahịa.
5Onye maara ihe na-emeri site nʼịdị ike, ndị nwere ọmụma ihe na-akpali ike ha.
6Ejela ọgụ ma ọ bụghị na i nwetara ezi ndụmọdụ, nʼihi na nzọpụta dị nʼige ọtụtụ ndị ndụmọdụ ntị.