Ilu 25

Ndụmọdụ e nyere nʼoge kwesiri ekwesi dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo e tinyere nʼefere ọlaọcha.

Proverbs 25:11 (UKJV) A word fitly spoken is like apples of gold in pictures of silver.

9Ọ bụrụ na gị na onye ọzọ enwee esemokwu, dozienụ ya nʼonwe unu, emekwala ka ndị ọzọ mata okwu nzuzo gị na onye ọzọ kwuru,

10ma ọ bụghị ya, onye nụrụ ya nwere ike menye gị ihere, agwa ọjọọ gị agaghị enwekwa ọgwụgwụ.

11Ndụmọdụ e nyere nʼoge kwesiri ekwesi dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo e tinyere nʼefere ọlaọcha.

12Dịka ọlantị ọlaedo maọbụ ihe ịchọ mma nke ọlaedo mara mma ka mba onye maara ihe bụ na ntị onye na-anụ ya.

13Onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ntute na ndụ, dịka mmiri oyi si eme ka ahụ dị jụụ nʼoge okpomọkụ owuwe ihe ubi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.