14Dịka ibo ọnụ ụzọ si emegharị nʼihe nkonye ya, otu a ka onye umengwụ si na-atụgharị onwe ya nʼelu ihe ndina ya.
15Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri ma oke umengwụ a naghị ekwe ka o weghachi ya tinye nʼọnụ ya.
16Nʼuche ya, onye umengwụ na-eche na ọ maara ihe karịa ndị ikom asaa na-eji ezi uche azaghachi okwu.
17Onye na-etinye onwe ya nʼesemokwu na-agbasaghị ya dị ka mmadụ na-apụ nʼokporoụzọ dọkpụrụ nkịta ọbụla ọ hụrụ na ntị.
18Dịka onye ara na-agba àkụ na-ere ọkụ nke na-eweta ọnwụ,