6Iziga ozi site nʼaka onye nzuzu dịka mmadụ ibipụ ụkwụ ya maọbụ ịṅụ ihe ike dịka mmiri.
7Dịka onye ngwụrọ si eji ụkwụ ya eje ije, otu a ka ilu si esite nʼọnụ onye nzuzu apụta.
8Ọ baghị uru inye onye nzuzu nsọpụrụ, nʼihi na ọ gaghị anọgide. Ọ dị ka ịwụ ọkụkọ mmiri nʼazụ.
9Dịka ogwu manyere nʼaka onye na-aṅụbiga mmanya oke otu a ka ilu dị nʼọnụ onye nzuzu.
10Dịka ọgba ụta si agba ụta ya na-enweghị onye o bụ nʼobi, otu a ka ọ dị bụ onye na-enye onye nzuzu maọbụ onye o bụla na-agafe nʼụzọ ọrụ ka o rụọra ya.