1Anyala isi banyere echi, nʼihi na ị maghị ihe echi ga-abụ.
2Ka onye ọzọ too gị, ọ bụghị ọnụ gị. Ka onye ọzọ too gị, ka egbugbere ọnụ gị abụọ ghara ito gị.
3Nkume dị arọ, aja bụkwa ibu arọ, ma mkpasu iwe nke onye nzuzu dị arọ karịa ha abụọ.
4Iwe na-emebi ihe, ma ekworo jọrọ njọ karịa iwe.