19Dịka e si ahụ ihu mmadụ nʼime mmiri otu a ka obi mmadụ si egosi ihe onye ahụ bụ.
20Dịka afọ adịghị eju ọnwụ na mbibi, otu a ihe na-agụ anya mmadụ adịghị agwụ agwụ.
21Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo ma a na-anwale ndị mmadụ site nʼotuto a na-enye ha.
22Nʼagbanyeghị na ị ga-egwepịa onye nzuzu nʼime ikwe, were aka odo gwee ha dịka mkpụrụ ọka, ị pụghị isite nʼahụ ha wepụ enweghị uche ha.
23Lezie ọrụ gị anya nke ọma, marakwa ọnọdụ igwe ewu na atụrụ gị na anụ ụlọ ndị ọzọ,