24nʼihi na akụnụba adịghị adịgide. Ọ bụladị okpueze nke onye eze na-emesịa gabiga.
25Mgbe e gbupụchara ahịhịa ochie, nke ọhụrụ na-epupụta, mgbe ahụ ka a na-achịkọbata ahịhịa sị nʼugwu.
26Ụmụ atụrụ ga-enye gị uwe ị ga-eyi, ụmụ ewu ga-enyekwa gị ego ọnụahịa ala ubi gị.
27Ị ga-enwe mmiri ara ewu nke ga-ezuru gị na ndị ezinaụlọ gị nri, na nke ga-edozi ahụ ndị odibo nwanyị gị.