10Onye ọbụla na-eduhie ndị ziri ezi nʼụzọ ihe ọjọọ, ga-adaba nʼọnya ahụ ha onwe ha gbara, ma ndị na-enweghị ịta ụta ga-anata ezi ihe nketa.
11Nʼanya nke onwe ya, onye ọgaranya na-agụ onwe ya dịka onye maara ihe, ma nʼezie, onye ogbenye nwere nghọta na-enyochapụta amaghị ihe nke onye ọgaranya.
12Mgbe ihe na-agara ndị ezi omume nke ọma, onye ọbụla na-aṅụrị ọṅụ, ma onye ọbụla na-ezo onwe ya mgbe onye na-emebi iwu na-aga nʼihu.
13Onye na-ezo mmehie ya agaghị enwe ọganihu na ndụ ya. Ma onye na-ekwupụta mmehie ya hapụkwa ha, ka a ga-emere ebere.
14Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ na-atụ egwu Chineke, ma onye na-enupu isi na-etinye onwe ya na nsogbu.