13Onye na-ezo mmehie ya agaghị enwe ọganihu na ndụ ya. Ma onye na-ekwupụta mmehie ya hapụkwa ha, ka a ga-emere ebere.
14Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ na-atụ egwu Chineke, ma onye na-enupu isi na-etinye onwe ya na nsogbu.
15Dịka ọdụm na-agbọ ụja maọbụ nne bịa na-achụ mmadụ otu a ka onye ọchịchị ọjọọ nke na-achị ndị na-enweghị ike dị.
16Ọ bụ naanị eze na-amaghị ihe ga-akpagbu ndị ya; ma eze ga-achị ogologo oge bụ eze kpọrọ iri ngarị asị.
17Obi ogbu mmadụ ga na-ama ya ikpe ruo ala mmụọ. Ka onye ọbụla ghara inyere ya aka.