19Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba, ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, ụbịam ga-eju ya afọ.
20Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị, ma nwoke ahụ na-achọ ịbụ ọgaranya ngwangwa aghaghị inweta ntaramahụhụ.
21Ile mmadụ anya nʼihu nʼoge ikpe jọgburu onwe ya. Ma ụfọdụ ndị ikpe na-eme ihe na-ezighị ezi, ọ bụladị, nʼihi iberibe nri.
22Onye aka ntagide ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịghọ ọgaranya amaghị na ụkpa nọ na-eche ya.
23Onye ọbụla na-abara mmadụ mba, nʼikpeazụ ga-enweta amara karịa onye ahụ na-aja mmadụ ibe ya mma ire ụtọ.