Ilu 28

Nwoke ahụ na-atụkwasị onwe ya obi bụ onye nzuzu! Ma ndị na-agbaso amamihe Chineke, aka adịghị akpa ha.

Proverbs 28:26 (UKJV) He that trusts in his own heart is a fool: but whoso walks wisely, he shall be delivered.

24Nwoke na-ezu nne na nna ya ohi ma na-asịkwa, “Olee ihe ọjọọ dị na ya?” Onye dị otu a bụ nnọọ enyi ndị mbibi.

25Ndị oke ọchịchọ na-akpali ise okwu, ma ndị na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-enwe ọganihu.

26Nwoke ahụ na-atụkwasị onwe ya obi bụ onye nzuzu! Ma ndị na-agbaso amamihe Chineke, aka adịghị akpa ha.

27Ọ bụrụ na i nye ogbenye, a ga-egboro gị mkpa gị. Ma ọbụbụ ọnụ dịrị ndị ahụ na-ekpuchi anya ha nʼebe ndị ogbenye nọ.

28Mgbe ndị ajọ omume na-aga nʼihu, ndị ezi omume na-ezo onwe ha, ma mgbe ha nʼala nʼiyi, ndị ezi omume nʼaba ụba.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.