22Onye aka ntagide ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịghọ ọgaranya amaghị na ụkpa nọ na-eche ya.
23Onye ọbụla na-abara mmadụ mba, nʼikpeazụ ga-enweta amara karịa onye ahụ na-aja mmadụ ibe ya mma ire ụtọ.
24Nwoke na-ezu nne na nna ya ohi ma na-asịkwa, “Olee ihe ọjọọ dị na ya?” Onye dị otu a bụ nnọọ enyi ndị mbibi.
25Ndị oke ọchịchọ na-akpali ise okwu, ma ndị na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-enwe ọganihu.
26Nwoke ahụ na-atụkwasị onwe ya obi bụ onye nzuzu! Ma ndị na-agbaso amamihe Chineke, aka adịghị akpa ha.