7Ụmụ okorobịa nwere nghọta na-eme ihe iwu kwuru, ma nwa nke ya na ndị oke oriri bụ enyi na-emenye nna ya ihere.
8Onye na-eme ka akụ ya baa ụba site na ịnara ụma maọbụ ọmụrụnwa nʼaka onye ogbenye, na-ekpokọta ya nye onye ọzọ, onye na-emere ndị ogbenye ebere.
9Onye na-ewezuga ntị ya site nʼebe iwu m dị, ọ bụladị ekpere ha bụ ihe arụ.
10Onye ọbụla na-eduhie ndị ziri ezi nʼụzọ ihe ọjọọ, ga-adaba nʼọnya ahụ ha onwe ha gbara, ma ndị na-enweghị ịta ụta ga-anata ezi ihe nketa.
11Nʼanya nke onwe ya, onye ọgaranya na-agụ onwe ya dịka onye maara ihe, ma nʼezie, onye ogbenye nwere nghọta na-enyochapụta amaghị ihe nke onye ọgaranya.