21Ị malite na mbụ na-emezi onye na-ejere gị ozi, ọ ga-emesịa chọọ ka i meere ya dịka nwa gị.
22Onye na-ewe iwe na-akpali ọgụ, onye na-ewe iwe ọkụ na-eme ọtụtụ mmehie.
23Nganga mmadụ na-eme ka ọ daa, ma mmadụ ahụ dị umeala nʼobi ga-eweta nsọpụrụ.
24Ndị ọbụla na-enyere ndị ohi aka bụ ndị iro nke ndụ ha, a na-edu ha nʼịṅụ iyi, ma ha adịghị agba akaebe.
25Ịtụ egwu mmadụ bụ ihe ịma nʼọnya, ma onye ọbụla na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọ nʼudo.