Ilu 3

Ha na-eme ka ị na-aga ije nʼụzọ gị na-enweghị ihe egwu maọbụ ihe mkpọbi ụkwụ.

Proverbs 3:23 (UKJV) Then shall you walk in your way safely, and your foot shall not stumble.

21Nwa m nwoke, ekwela ka ihe abụọ ndị a site nʼihu gị wezuga onwe ha: amamihe na nghọta nke ime ihe dị mma nʼizuzu zuruoke,

22nʼihi na ha na-enye gị ndụ ọhụrụ, ha bụkwaara gị ihe ịchọ mma amara nʼolu gị.

23Ha na-eme ka ị na-aga ije nʼụzọ gị na-enweghị ihe egwu maọbụ ihe mkpọbi ụkwụ.

24Mgbe ị ga-edina ala, ị gaghị atụ egwu, ị ga-edina ala ụra gị ga-adị ụtọ.

25Ị gaghị atụ egwu ihe mbibi mberede ọbụla maọbụ tụọ egwu ịla nʼiyi nke na-abịakwasị ndị ajọ omume.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.