20Esitere nʼihe ọmụma ya kewaa ogbu mmiri niile, igwe ojii na-atụdakwa igirigi.
21Nwa m nwoke, ekwela ka ihe abụọ ndị a site nʼihu gị wezuga onwe ha: amamihe na nghọta nke ime ihe dị mma nʼizuzu zuruoke,
22nʼihi na ha na-enye gị ndụ ọhụrụ, ha bụkwaara gị ihe ịchọ mma amara nʼolu gị.
23Ha na-eme ka ị na-aga ije nʼụzọ gị na-enweghị ihe egwu maọbụ ihe mkpọbi ụkwụ.
24Mgbe ị ga-edina ala, ị gaghị atụ egwu, ị ga-edina ala ụra gị ga-adị ụtọ.