27Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọ mgbe ọ dị gị nʼaka ime ya.
28A sịkwala onye agbataobi gị laa, bịaghachi azụ echi mgbe i nwere ike ime ya taa.
29Agbala izu ọjọọ megide onye agbataobi gị, nʼihi na o nwere ntụkwasị obi nʼebe ị nọ.
30Ebola mmadụ ebubo na-enweghị isi, mgbe onye ahụ na-emeghị gị ihe ọjọọ ọbụla.
31Ekwosola onye na-eme ihe ike ekworo maọbụ họrọ ụzọ ya ọbụla.