Ilu 3

Mgbe ahụ, ị ga-enwe ihuọma na ezi aha nʼanya Chineke na nʼihu mmadụ.

Proverbs 3:4 (UKJV) So shall you find favour and good understanding in the sight of God and man.

2Nʼihi na ha ga-eme ka ndụ gị dị ogologo ruo ọtụtụ afọ, wetakwara gị udo na ọganihu.

3Ekwela ka ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi hapụ gị, kekwasị ha nʼolu gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.

4Mgbe ahụ, ị ga-enwe ihuọma na ezi aha nʼanya Chineke na nʼihu mmadụ.

5Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile, adaberekwala na nghọta gị.

6Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.