4Mgbe ahụ, ị ga-enwe ihuọma na ezi aha nʼanya Chineke na nʼihu mmadụ.
5Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile, adaberekwala na nghọta gị.
6Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.
7A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị. Tụọ Onyenwe anyị egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị.
8Nke a ga-eme ka i nwee ahụ ike gbaakwa ọkpụkpụ gị ume.