6Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.
7A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị. Tụọ Onyenwe anyị egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị.
8Nke a ga-eme ka i nwee ahụ ike gbaakwa ọkpụkpụ gị ume.
9Sọpụrụ Onyenwe anyị site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị, na mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị.
10Mgbe ahụ ka ọ ga-eme ka ọba gị niile jubigakwa oke, ebe ịnara mmanya gị ga-ejupụta na mmanya ọhụrụ.